Amanitore

Amanitore, nke a na-akpọkwa Amanitere ma ọ bụ Amanitar,[1] bụ eze nwanyị nke alaeze Kush, onye chịrị site na Meroë n’etiti narị afọ mbụ AD.[2] Ya na nwa ya nwoke, Natakamani, chịrị alaeze ahụ. Ọchịchị Amanitore na Natakamani bụ oge e nwere ọtụtụ ihe akaebe gbasara ya, ma o yikwara ka ọ bụ oge ọganihu na ịba ụba. O nwere ike ịbụ na ha biri n’otu oge ahụ na eze ukwu Nero.
Ndụ ya
A maara Amanitore na Natakamani site n’ili ha na ọtụtụ ihe ncheta nke na-egosi ha abụọ ọnụ. Ndị ọkà mmụta mbụ chere na Amanitore bụ nwunye Natakamani, ma ugbu a a na-ekwenyekarị na ha bụ nne na nwa nwoke. Nke a bụ n’ihi na ihe odide oge ochie a chọtara n’Ụlọ Nsọ Dakka na-egosi na Amanitore bụ nne Natakamani.[2]
N’oge ha na-achị, ọ bụ naanị Natakamani ka a kpọrọ aha doro anya dị ka onye ọchịchị (qore), ebe a na-akpọ Amanitore kandake (eze nwanyị/nne eze).[3] Otú ọ dị, a na-egosi ha n’ụzọ doro anya dị ka ndị ọchịchị ibe ha nwere ikike hà nhata n’ihi na a na-egosipụta ha abụọ na regalia na uwe ndị eze.[4] Ọ dịghị mgbe e nwere ihe àmà na-egosi na Natakamani ma ọ bụ Amanitore chịrị n’onwe ha na-enweghị onye nke ọzọ.[5] E liri Amanitore na pyramid nke ya na Meroë, Beg. N 1.[6] Lli ahụ dị ihe dịka square mita isii n’ala ya, ọ bụghị pyramid n’echiche mgbakọ na mwepụ.
- ↑ Richard A. Lobban Jr. (2020-10-20). Historical Dictionary of Medieval Christian Nubia. Rowman & Littlefield. ISBN 978-1-5381-3341-5.
- ↑ 2.0 2.1 Kuckertz, Josefine (2021). "Meroe and Egypt". UCLA Encyclopedia of Egyptology: 5, 13, 17.
- ↑ (1998) Fontes Historiae Nubiorum: Textual Sources for the History of the Middle Nile Region Between the Eighth Century BC and the Sixth Century AD: Vol. III: From the First to the Sixth Century AD. University of Bergen, 897–899, 903, 908, 910. ISBN 82-91626-07-3.

Content Disclaimer
Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.
- The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
- There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
- It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
- Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
- Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.