Chima Williams
Chima Williams bụ onye na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, onye ọka iwu gburugburu ebe obibi nke na-alụso ma na e megide ikpe na-ezighị ezi gburugburu ebe obibi ma nwee ụlọ ọrụ mba dị iche iche dị ka Shell iji kwụọ ụgwọ maka mmebi ha kpatara ma kpatara ụfọdụ obodo na Niger-Delta. Ọ bụkwa onye guzobere otu ikpe ziri ezi nke ụmụ akwụkwọ mbụ na Naịjirịa.A kpọrọ ya ony na-agbachitere ụwa.[1][2][3][4]
Ọrụ
Chima Williams dị ka nwa akwụkwọ sonyeere Nigerian Environmental Movement n'afọ 1990s ebe ọ wepụtara onwe ya maka Environmental Rights Action (ERA), otu NGO nke e guzobere n'afọ 1993, nke na-akwado ikike gburugburu ebe obibi na Naijiria. N'afọ 1998, Chima guzobere otu ikpe ziri ezi nke ụmụ akwụkwọ mbụ na Naịjirịa. Ọ na-eje ozi dị ka onye ọka iwu gburugburu ebe obibi na-ekpe ụlọ ọrụ mba dị iche iche ikpe maka ikpe mmetọ gburugburu ebe obibi Naịjirịa. N'ọnwa Ọktoba n'afọ 2020, a họpụtara ya dị ka onye isi nchịkwa nke Environmental Rights Action / Friends of the Earth Nigeria (ERA / FoEN). Environmental Rights Action (ERA) nke bụ otu NGO na-akwado ndị mmadụ nke e guzobere na Jenụwarị 11, 1993 na Naijiria iji lụso nsogbu ndị ruuru mmadụ gburugburu ebe obibi ọgụ na Naijeria. ERA bụ isi nke Naijiria nke Friends of the Earth International (FoEI)[5][6][7]
Onyinye
Chima Williams bụ otu n'ime ndị nwetara onyinye nke 2022 Goldman Environmental Prize gafee ụwa. Ọ bụ onye Naijiria nke atọ nwetara ihe nrite ahụ. E nyere onyinye ahụ maka ọrụ ya n'ichebe ụwa site n'ịgba Royal Dutch Shell ụta maka mmanụ si n'ụlọ ọrụ ha wụba n'ime obodo Niger Delta. A na-enye onyinye Goldman iji kwanyere ùgwù ma nwee ekele maka ọrụ nke ndị na-ahụ maka gburugburu ebe obibi n'ụwa niile na-arụ ọrụ iji chebe ụwa[8][9]
Ebensidee
- ↑ Chima Williams - Goldman Environmental Prize (en-US) (2022-04-19). Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Alade (2022-05-25). Nigerian activist, Chima Williams, wins Goldman Environmental Prize (en-GB). Daily Trust. Archived from the original on 2022-11-12. Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Simire (2022-05-25). Head of ERA/FoEN, Chima Williams, six others win Goldman Environmental Prize (en-US). EnviroNews Nigeria. Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Oboh (2022-05-26). Chima Williams, ERA/FoEN ED, six others win Goldman Environmental Prize (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Alade (2022-05-25). Nigerian activist, Chima Williams, wins Goldman Environmental Prize (en-GB). Daily Trust. Archived from the original on 2022-11-12. Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Times (2022-05-25). Nigerian activist, six others win Goldman environmental prize (en-GB). Premium Times Nigeria. Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Environmental Rights Action | Friends of the Earth Nigeria (en-US). Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Chima Williams wins 2022 goldman environmental prize (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-06-04). Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Oboh (2022-05-26). Chima Williams, ERA/FoEN ED, six others win Goldman Environmental Prize (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-11-12.
Content Disclaimer
Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.
- The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
- There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
- It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
- Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
- Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.