Isiagu
| Obere ụdị nke | WikiProject |
|---|---|
| Nwere ojiji | Ilu nwanyi na omenala igbo |
| Ebe | Naijiria |
| Ndị ji ya eme ihe | Ndị Igbo |


Isiagu, nke a bu isi anụmanụ a kpọrọ Agụ. A na-ewe onye gburu Agụ dị ka onye siri ezigbo ike na anaghị atụ egwu. Ọtụtụ oge a na-eyu onye ahụ ogbuagụ dị ka Aha ya. Efe IsiagụUgbu a a na-ebi ya n'ụdịrị akwa pụrụ iche ndị Igbo ji egosipụta ekịke na omenaala ha. Na mbụ, Ọ bụ naanị ụmụ nwoke na-eyi ya tụmadi ndị chiri echichi, Efe Isiagụ na-enye onye ọbula yi ya ebube na ugwu nke a mere ndị Igbo ji atụ ilu sị na ebube agụ na-eche agụ. Ugbu a, n'ihi na efe isiagu a dị ọgọ dikwa ebube, ndi echighi echichi , umunwaanyi, ụmụaka nakwa ndị abụghị ndị igbo na-eyikwa ya. A na-eyikarị uwe Isiagu n'oge emume puru iche dị ka agbamakwụkwọ, iri-ji ohu, igba nkwụ, nakwa emume ndị ọzọ dị iche iche. Ọ na ahiahụ onye yi Uwe Isiagụ bata n'ọgbọ aghara igba ya nkiri. Enwere ụzọ dị iche iche esi akwa Efe isiagụ a , ụfọdụ na adị ogologo ma ọ bụ dị mkpụmkpụ, Ụfọdụ uwe nwere bọtịnụ ọla edo na-ejikọta ya. E nwere ike iji uwe ukwụ wee jie ya maọbụ were akwa ọmụma wee yie ya. Ufodu na-acha uhie uhie, ọbara ọbara, edo edo ma obu ojii ojii, mana ihe kacha ebunye a uwe a ebube bụ isiagụ esere n,ahụ ya. Iji mee ka ekike a zuo oke ana eji okpu na-acha ọbara ọbara wee kpuru n'isi onye yi akwa a. Mgbe ụfọdụ ana eji aka wee chọọ okpu ahụ mma. Ụmụ nwaanyị nwere ike ike ịchafụ maọbụkwa aka wee dozie isi ha. [1][2][3]
Lee kwa
- Ndi Igbo
- Okpu
ihe ngosi
- Uwe Isiagu
Lịnkị ndị ọzọ
- Ịme emume onyeisi [1]
- Kedu ekike ejiri mara ndi Igbo? [http://thelongharmatre
Ebe nsi nweta
- ↑ Archive copy. Archived from the original on 2020-05-09. Retrieved on 2020-06-01.
- ↑ https://www.momoafrica.com/ways-wear-isiagu-stylishly-men/
- ↑ https://www.legit.ng/1187695-isi-agu-attire-ladies.html
Content Disclaimer
Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.
- The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
- There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
- It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
- Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
- Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.