Prakash Chandra Das

Prakash Chandra Das (amụrụ 27 Nọvemba 1958) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Bharatiya Janata Party si steeti Tripura, India. Ọ bụbu onye minista na gọọmentị mmekorita INC-TUJS nke chịrị steeti Tripura n'etiti 1988-1993 na onye omeiwu ugboro atọ. Ọ gbara ọsọ dịka onye ndoro-ndoro ochichi National Congress nke India sitere na mpaghara Bamutia (SC) ugboro isii n'usoro site na 1988 ruo 2013 meriri ugboro atọ, na 1988, 1998 na 2003.[1]

Oge ọ malitere

A mụrụ ya na 27 Nọvemba 1958. O mere ngụsị akwụkwọ nke Bachelor of Arts in History site na Maharaja Bir Bikram College, mgbe ahụ n'okpuru University of Calcutta.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

O tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ dị obere site na National Students' Union of India na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụmụ akwụkwọ. Ọ zọọrọ dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba India na ntuli aka ọgbakọ 1988 site na mpaghara ọgbakọ 3-Bamutia ebe ọ meriri onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Communist Party of India (Marxist) ma bụrụkwa onye ozi na njikọ aka INC-TUJS nke chịrị steeti ahụ site na 1988 ruo 1993. Ọ meriri ọzọ site na otu mpaghara na 1998 na na 2003. Ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi oche nke pradesh youth congress, Tripura Pradesh Congress Committee General Secretary, onye so na All India Congress Committee. Ọ bụkwa onye isi oche nke Tripura Pradesh Congress Committee SC Department site na 2004 ruo mgbe ọ gbara arụkwaghịm na pati ahụ na June, 2016. E kwupụtara ya dị ka osote onye isi oche nke Tripura Pradesh Trinamool Congress. Ọ kwụsịrị trinamool wee sonye na BJP n'April, 2017. Ọ laghachiri INC na March 2019. Ọ kwụsịrị INC wee sonye AITC na Julaị, 2021.

Ihe omume ndị ọzọ

Ọ na-arụsi ọrụ ike n'ihe ndị metụtara ịkwalite ndị a haziri ahazi na agbụrụ ndị a hazirinụ ahazi na iweta ha nhata na inye ha ike n'ụzọ akụ na ụba. Ọ bụ onye isi oche nke Dr. B.R. Ambedkar Smriti Jan Kalyan Sanstha, otu na-abụghị nke gọọmentị.

Ebem si dee

  1. 3 - Bamutia (SC) Assembly Constituency, Election Commission of India

Content Disclaimer

Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.

  1. The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
  2. There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
  3. It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
  4. Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
  5. Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.